Daniel 11

Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.

Daniel 11:9 (UKJV) So the king of the south shall come into his kingdom, and shall return into his own land.

7“Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri.

8Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole.

9Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.

10Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike.

11“Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.