8Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole.
9Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.
10Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike.
11“Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu.
12Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu.