Daniel 2

Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?”

Daniel 2:26 (UKJV) The king answered and said to Daniel, whose name was Belteshazzar, Are you able to make known unto me the dream which I have seen, and the interpretation thereof?

24Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.”

25Mgbe ahụ, Ariok mere ngwangwa duru Daniel gaa nʼihu eze, sị ya, “Achọpụtala m otu onye nʼime ndị Juda a dọtara nʼagha nwere ike ịgwa eze ihe nrọ ya pụtara.”

26Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?”

27Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ.

28Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.