Daniel 2

“Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme.

Daniel 2:29 (UKJV) As for you, O king, your thoughts came into your mind upon your bed, what should come to pass hereafter: and he that reveals secrets makes known to you what shall come to pass.

27Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ.

28Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:

29“Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme.

30Ma mụ onwe m, ekpugheghị ihe omimi a nye m nʼihi na m karịrị mmadụ ọbụla dị ndụ nʼamamihe, kama ọ bụ ka gị bụ eze mata nkọwa ya ma ghọtakwa ihe gabigara nʼuche gị.

31“Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.