Daniel 2

Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

Daniel 2:45 (UKJV) Forasmuch as you saw that the stone was cut out of the mountain without hands, and that it brake in pieces the iron, the brass, the clay, the silver, and the gold; the great God has made known to the king what shall come to pass hereafter: and the dream is certain, and the interpretation thereof sure.

43Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ.

44“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.

45Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

46Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja.

47Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.