Daniel 2

Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.

Daniel 2:48 (UKJV) Then the king made Daniel a great man, and gave him many great gifts, and made him ruler over the whole province of Babylon, and chief of the governors over all the wise men of Babylon.

46Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja.

47Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”

48Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.

49Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.