4Mgbe ahụ, ndị ahụ na-enyocha kpakpando gwara eze ahụ okwu nʼasụsụ ndị Siria sị, “Ka gị eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Ị ga-agwa ụmụodibo gị nrọ a ị rọrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.”
5Ma eze zara ndị Kaldịa, “Nke a bụ ihe m kpebirila: Ọ bụrụ na unu agwaghị m ihe nrọ a na nkọwa ya bụ, aga m eme ka abọkasịa unu, tikpọkwa ụlọ unu, mee ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe.
6Ma ọ bụrụ na unu gwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ ma kọwaakwa ya, aga m enye unu onyinye dị iche iche na ụgwọ ọrụ nsọpụrụ dị ukwuu. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ na nkọwa ya.”
7Ọzọkwa, ha zaghachiri, “Ka eze gwa ndị ohu ya ihe ọ rọrọ na nrọ, anyị ga-akọwakwa ya.”
8Eze zaghachiri, “Ama m na ọ bụ oge ka unu na-achọ inweta nʼihi na unu amatala na ihe a ka m kpebiri ime.