10Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,
11na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.
12Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.”
13Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
14Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?