Daniel 3

Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.

Daniel 3:16 (UKJV) Shadrach, Meshach, and Abednego, answered and said to the king, O Nebuchadnezzar, we are not careful to answer you in this matter.

14Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?

15Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”

16Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.

17Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị.

18Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.