13Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
14Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?
15Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”
16Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.
17Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị.