Daniel 3

Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.

Daniel 3:21 (UKJV) Then these men were bound in their coats, their upper garments, and their hats, and their other garments, and were cast into the midst of the burning fiery furnace.

19Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri.

20Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu.

21Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.

22Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.

23Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.