Daniel 3

Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.

Daniel 3:22 (UKJV) Therefore because the king's commandment was urgent, and the furnace exceeding hot, the flames of the fire slew those men that took up Shadrach, Meshach, and Abednego.

20Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu.

21Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.

22Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.

23Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.

24Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.