Daniel 3

Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”

Daniel 3:24 (UKJV) Then Nebuchadnezzar the king was astonished, and rose up in haste, and spoke, and said unto his counsellors, Did not we cast three men bound into the midst of the fire? They answered and said unto the king, True, O king.

22Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.

23Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.

24Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”

25Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”

26Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.