Daniel 3

Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a,

Daniel 3:4 (UKJV) Then an herald cried aloud, To you it is commanded, O people, nations, and languages,

2Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.

3Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.

4Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a,

5mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ.

6Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.