Daniel 4

“Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata.

Daniel 4:13 (UKJV) I saw in the visions of my head upon my bed, and, behold, a watcher and an holy one came down from heaven;

11Osisi a toro sie ike, ịdị elu ya rukwara nʼeluigwe, a na-ahụkwa ya anya site na nsọtụ nke ụwa niile.

12Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri.

13“Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata.

14O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ.

15Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu. “ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.