34Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
35Mmadụ niile bi nʼụwa bụ ihe efu nʼihu ya. Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe, na nʼetiti ndị bi nʼụwa. O nweghị onye pụrụ igbochi ya, maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?”
36Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.
37Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.