7Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.
8Nʼikpeazụ, Daniel batara nʼihu m, onye aha ya bụ Belteshaza dịka aha chi m si dị, onye mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime ya. Akọọrọ m ya ihe ahụ m rọrọ na nrọ.
9Asịrị m, “Belteshaza, onyeisi ndị nkọwa ihe niile. Amaara m na mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime gị. Amakwaara m na o nweghị ihe omimi ọbụla ga-esiri gị ike ịchọpụta ọsịsa ya. Ugbu a, nke a bụ nrọ m, kọwaara m ihe ọ pụtara.
10Mgbe m dina nʼelu akwa, nke a bụ ihe m hụrụ. E nwere otu osisi nke toro nʼetiti ụwa, ogologo ya dị ukwuu.
11Osisi a toro sie ike, ịdị elu ya rukwara nʼeluigwe, a na-ahụkwa ya anya site na nsọtụ nke ụwa niile.