12Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”
13Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?
14Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe.
15Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ.
16Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.”