10Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ.
11Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile.
12Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”
13Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?
14Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe.