18“Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma.
19Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala.
20Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.
21A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.
22“Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.