Daniel 5

A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.

Daniel 5:21 (UKJV) And he was driven from the sons of men; and his heart was made like the beasts, and his dwelling was with the wild asses: they fed him with grass like oxen, and his body was wet with the dew of heaven; till he knew that the most high God ruled in the kingdom of men, and that he appoints over it whomsoever he will.

19Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala.

20Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.

21A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.

22“Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.

23Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.