Daniel 5

“Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ.

Daniel 5:27 (UKJV) TEKEL; You are weighed in the balances, and are found lacking.

25“Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin

26“Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe.

27“Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ.

28“Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”

29Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.