29Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.
30Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa.
31Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.