1Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze.
2O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze.
3Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile.