5Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.
6Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.
7Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”
8Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.
9Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị.