8Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.”
9Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.
10Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.
11Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.
12Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”