Daniel 6

Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.

Daniel 6:11 (UKJV) Then these men assembled, and found Daniel praying and making supplication before his God.

9Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.

10Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.

11Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.

12Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”

13Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.