Daniel 6

Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma.

Daniel 6:25 (UKJV) Then king Darius wrote unto all people, nations, and languages, that dwell in all the earth; Peace be multiplied unto you.

23Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.

24Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.

25Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma.

26“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ.

27Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa. Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube nʼeluigwe na nʼụwa. Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel site nʼike ọdụm.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.