3Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile.
4Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya.
5Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.”
6Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile!
7Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm.