10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
11“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.
12(Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).
13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.
14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.