12(Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).
13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.
14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
15“Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.
16Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara.