20Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ.
21Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa.
22Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.
23“Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile.
24Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi.