Daniel 7

“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.

Daniel 7:6 (UKJV) After this I beheld, and lo another, like a leopard, which had upon the back of it four wings of a fowl; the beast had also four heads; and dominion was given to it.

4“Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.

5“Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’

6“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.

7“Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.

8“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.