Daniel 7

“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.

Daniel 7:8 (UKJV) I considered the horns, and, behold, there came up among them another little horn, before whom there were three of the first horns plucked up by the roots: and, behold, in this horn were eyes like the eyes of man, and a mouth speaking great things.

6“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.

7“Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.

8“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.

9“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.

10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.