16Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”
17Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”
18Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.
19Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.
20Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.