Daniel 8

“Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.

Daniel 8:23 (UKJV) And in the latter time of their kingdom, when the transgressors are come to the full, a king of fierce countenance, and understanding dark sentences, shall stand up.

21Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.

22Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.

23“Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.

24Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi.

25Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.