Daniel 8

Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.

Daniel 8:3 (UKJV) Then I lifted up mine eyes, and saw, and, behold, there stood before the river a ram which had two horns: and the two horns were high; but one was higher than the other, and the higher came up last.

1Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ.

2Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.

3Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.

4Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.

5Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.