1Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ.
2Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.
3Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.