10Anyị erubeghị isi nye Onyenwe anyị Chineke anyị, maọbụ debe iwu ahụ o nyere anyị site nʼaka ndị ohu ha bụ ndị amụma.
11Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị. “Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị.
12O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe.
13Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị.
14Onyenwe anyị kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi.