Daniel 9

Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu.

Daniel 9:16 (UKJV) O LORD, according to all your righteousness, I plead to you, let yours anger and your fury be turned away from your city Jerusalem, your holy mountain: because for our sins, and for the iniquities of our fathers, Jerusalem and your people are become a reproach to all that are about us.

14Onyenwe anyị kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi.

15“Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa.

16Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu.

17“Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.

18Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.