Daniel 9

“Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị.

Daniel 9:7 (UKJV) O LORD, righteousness belongs unto you, but unto us confusion of faces, as at this day; to the men of Judah, and to the inhabitants of Jerusalem, and unto all Israel, that are near, and that are far off, through all the countries where you have driven them, because of their trespass that they have trespassed against you.

5Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ.

6Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị.

7“Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị.

8Onyenwe anyị, ihere emegbuola anyị. Ihere dịrị ndị eze anyị, dịkwara ndịisi anyị na ndị nna anyị, nʼihi na anyị emeela mmehie megide gị.

9Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.