10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe.
11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.
12Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?
13Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”
14Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”