Diuteronomi 1

Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”

Deuteronomy 1:14 (UKJV) And all of you answered me, and said, The thing which you have spoken is good for us to do.

12Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?

13Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”

14Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”

15Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche.

16Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.