Diuteronomi 1

Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.

Deuteronomy 1:24 (UKJV) And they turned and went up into the mountain, and came unto the valley of Eshcol, and searched it out.

22Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”

23Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.

24Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.

25Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”

26Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.