20Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.
21Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”
22Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”
23Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.
24Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.