Diuteronomi 1

Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”

Deuteronomy 1:21 (UKJV) Behold, the LORD your God has set the land before you: go up and possess it, as the LORD God of your fathers has said unto you; fear not, neither be discouraged.

19Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.

20Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.

21Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”

22Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”

23Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.