Diuteronomi 1

Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.

Deuteronomy 1:19 (UKJV) And when we departed from Horeb, we went through all that great and terrible wilderness, which all of you saw by the way of the mountain of the Amorites, as the LORD our God commanded us; and we came to Kadeshbarnea.

17Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.

18Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime.

19Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.

20Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.

21Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.