Diuteronomi 1

Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.

Deuteronomy 1:3 (UKJV) And it came to pass in the fortieth year, in the eleventh month, on the first day of the month, that Moses spoke unto the children of Israel, according unto all that the LORD had given him in commandment unto them;

1Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab.

2Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.

3Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.

4Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.

5Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.