Diuteronomi 1

Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.

Deuteronomy 1:4 (UKJV) After he had slain Sihon the king of the Amorites, which dwelt in Heshbon, and Og the king of Bashan, which dwelt at Astaroth in Edrei:

2Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.

3Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.

4Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.

5Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,

6Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.