Diuteronomi 1

Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.

Deuteronomy 1:6 (UKJV) The LORD our God spoke unto us in Horeb, saying, All of you have dwelt long enough in this mount:

4Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.

5Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,

6Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.

7Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.

8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.